The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Zephaniah 2

Zephaniah 2:13

Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.

Zephaniah 2:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Zephaniah 2Next →

Zephaniah 2:13 in other translations

KJV King James Version

And he will stretch out his hand against the north, and destroy Assyria; and will make Nineveh a desolation, and dry like a wilderness.

BSB Berean Standard Bible

And He will stretch out His hand against the north and destroy Assyria; He will make Nineveh a desolation, as dry as a desert.

WEB World English Bible

He will stretch out his hand against the north, destroy Assyria, and will make Nineveh a desolation, as dry as the wilderness.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.

12 “Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”

13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.

14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.

15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.

Read Zephaniah 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV