The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Zechariah 9

Zechariah 9:2

Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

Zechariah 9:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Zechariah 9Next →

Zechariah 9:2 in other translations

KJV King James Version

And Hamath also shall border thereby; Tyrus, and Zidon, though it be very wise.

BSB Berean Standard Bible

and also against Hamath, which borders it, as well as Tyre and Sidon, though they are very shrewd.

WEB World English Bible

and Hamath, also, which borders on it, Tyre and Sidon, because they are very wise.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Okwu Amụma. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak, na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike, nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile na ebo niile nke Izrel dị.

2 Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

3 Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.

4 Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.

5 Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.

Read Zechariah 9 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV