The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Zechariah 14

Zechariah 14:13

Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ.

Zechariah 14:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Zechariah 14Next →

Zechariah 14:13 in other translations

KJV King James Version

And it shall come to pass in that day, that a great tumult from the LORD shall be among them; and they shall lay hold every one on the hand of his neighbour, and his hand shall rise up against the hand of his neighbour.

BSB Berean Standard Bible

On that day a great panic from the LORD will come upon them, so that each will seize the hand of another, and the hand of one will rise against the other.

WEB World English Bible

It will happen in that day that a great panic from the LORD will be among them; and they will each seize the hand of his neighbor, and his hand will rise up against the hand of his neighbor.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze.

11 A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu.

12 Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke Onyenwe anyị ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha.

13 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ.

14 Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma.

15 Ọrịa ọjọọ dị otu a ga-adakwasị ịnyịnya niile, na ịnyịnya muul, na ịnyịnya kamel niile, na ịnyịnya ibu niile, na anụ niile dị nʼogige ndị agha ha.

16 Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ na mba niile ndị ahụ busoro Jerusalem agha, ga-abịa kwa afọ kpọọ isiala nye eze, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ka ha soro mee mmemme ụlọ Ikwu.

Read Zechariah 14 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV