The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Ruth 3
Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
Ruth 3:5 · Baịbụlụ Nsọ
And she said unto her, All that thou sayest unto me I will do.
“I will do everything you say,” Ruth answered.
She said to her, “All that you say, I will do.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.
3 Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.
4 Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
5 Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
6 Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
7 Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.
8 Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
Read Ruth 3 in the app The whole chapter