The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Romans 7

Romans 7:5

Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.

Romans 7:5 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Romans 7Next →

Romans 7:5 in other translations

KJV King James Version

For when we were in the flesh, the motions of sins, which were by the law, did work in our members to bring forth fruit unto death.

BSB Berean Standard Bible

For when we lived according to the flesh, the sinful passions aroused by the law were at work in our bodies, bearing fruit for death.

WEB World English Bible

For when we were in the flesh, the sinful passions which were through the law worked in our members to bring out fruit to death.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

2 Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.

3 A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.

4 Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.

5 Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.

6 Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.

7 Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,” agaraghị m ama na ọ bụ mmehie.

8 Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị.

Read Romans 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV