The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Romans 7
Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.
Romans 7:17 · Baịbụlụ Nsọ
Now then it is no more I that do it, but sin that dwelleth in me.
In that case, it is no longer I who do it, but it is sin living in me that does it.
So now it is no more I that do it, but sin which dwells in me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
14 Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.
15 O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.
16 Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.
17 Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.
18 O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.
19 Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
20 Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.
Read Romans 7 in the app The whole chapter