The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Romans 3
Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.
Romans 3:20 · Baịbụlụ Nsọ
Therefore by the deeds of the law there shall no flesh be justified in his sight: for by the law is the knowledge of sin.
Therefore no one will be justified in His sight by works of the law. For the law merely brings awareness of sin.
Because by the works of the law, no flesh will be justified in his sight; for through the law comes the knowledge of sin.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
17 Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo.
18 Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”
19 Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.
20 Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.
21 Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya.
22 Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya.
23 Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.
Read Romans 3 in the app The whole chapter