The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 7
Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
Proverbs 7:16 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 7Next →
I have decked my bed with coverings of tapestry, with carved works, with fine linen of Egypt.
I have decked my bed with coverings, with colored linen from Egypt.
I have spread my couch with carpets of tapestry, with striped cloths of the yarn of Egypt.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
14 “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.
16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.
18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.
19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
Read Proverbs 7 in the app The whole chapter