The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 5

Proverbs 5:6

Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.

Proverbs 5:6 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Proverbs 5Next →

Proverbs 5:6 in other translations

KJV King James Version

Lest thou shouldest ponder the path of life, her ways are moveable, that thou canst not know them.

BSB Berean Standard Bible

She does not consider the path of life; she does not know that her ways are unstable.

WEB World English Bible

She gives no thought to the way of life. Her ways are crooked, and she doesn’t know it.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

3 Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.

4 Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

5 Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.

6 Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.

7 Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.

8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

9 ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

Read Proverbs 5 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV