The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 31
Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
Proverbs 31:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 31Next →
It is not for kings, O Lemuel, it is not for kings to drink wine; nor for princes strong drink:
It is not for kings, O Lemuel, it is not for kings to drink wine, or for rulers to crave strong drink,
It is not for kings, Lemuel, it is not for kings to drink wine, nor for princes to say, ‘Where is strong drink?’
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
2 Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
3 Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
4 Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
5 Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
6 Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
7 Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
Read Proverbs 31 in the app The whole chapter