The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 30
Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
Proverbs 30:3 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 30Next →
I neither learned wisdom, nor have the knowledge of the holy.
I have not learned wisdom, and I have no knowledge of the Holy One.
I have not learned wisdom, neither do I have the knowledge of the Holy One.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
2 Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
3 Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
4 Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
5 “Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
6 Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
Read Proverbs 30 in the app The whole chapter