The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 30
“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
Proverbs 30:10 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 30Next →
Accuse not a servant unto his master, lest he curse thee, and thou be found guilty.
Do not slander a servant to his master, or he will curse you, and you will bear the guilt.
“Don’t slander a servant to his master, lest he curse you, and you be held guilty.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
7 “O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
8 Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
9 Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
10 “Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
11 “Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
12 Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
13 Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
Read Proverbs 30 in the app The whole chapter