The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 3
Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
Proverbs 3:16 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 3Next →
Length of days is in her right hand; and in her left hand riches and honour.
Long life is in her right hand; in her left hand are riches and honor.
Length of days is in her right hand. In her left hand are riches and honor.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
14 Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
15 Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
16 Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
18 Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
19 Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
Read Proverbs 3 in the app The whole chapter