The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 29
Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
Proverbs 29:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 29Next →
When the righteous are in authority, the people rejoice: but when the wicked beareth rule, the people mourn.
When the righteous flourish, the people rejoice, but when the wicked rule, the people groan.
When the righteous thrive, the people rejoice; but when the wicked rule, the people groan.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
2 Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
3 Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
4 Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
5 Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
Read Proverbs 29 in the app The whole chapter