The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 28
Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
Proverbs 28:23 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 28Next →
He that rebuketh a man afterwards shall find more favour than he that flattereth with the tongue.
He who rebukes a man will later find more favor than one who flatters with his tongue.
One who rebukes a man will afterward find more favor than one who flatters with the tongue.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
20 Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
21 Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
22 Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
23 Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
24 Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
25 Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
26 Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
Read Proverbs 28 in the app The whole chapter