The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 27
Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
Proverbs 27:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 27Next →
Wrath is cruel, and anger is outrageous; but who is able to stand before envy?
Wrath is cruel and anger is like a flood, but who can withstand jealousy?
Wrath is cruel, and anger is overwhelming; but who is able to stand before jealousy?
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
2 Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
3 Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
4 Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
5 Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
6 Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
7 Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
Read Proverbs 27 in the app The whole chapter