The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 23
Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
Proverbs 23:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 23Next →
Labour not to be rich: cease from thine own wisdom.
Do not wear yourself out to get rich; be wise enough to restrain yourself.
Don’t weary yourself to be rich. In your wisdom, show restraint.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
2 tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
3 Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
4 Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
5 Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
6 Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7 Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
Read Proverbs 23 in the app The whole chapter