The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 23
Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
Proverbs 23:22 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 23Next →
Hearken unto thy father that begat thee, and despise not thy mother when she is old.
Listen to your father who gave you life, and do not despise your mother when she is old.
Listen to your father who gave you life, and don’t despise your mother when she is old.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
19 Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
20 Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
21 nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
22 Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
23 Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
25 Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
Read Proverbs 23 in the app The whole chapter