The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 20
Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
Proverbs 20:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 20Next →
Love not sleep, lest thou come to poverty; open thine eyes, and thou shalt be satisfied with bread.
Do not love sleep, or you will grow poor; open your eyes, and you will have plenty of food.
Don’t love sleep, lest you come to poverty. Open your eyes, and you shall be satisfied with bread.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
14 “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
Read Proverbs 20 in the app The whole chapter