The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 18
Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
Proverbs 18:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 18Next →
He that answereth a matter before he heareth it, it is folly and shame unto him.
He who answers a matter before he hears it— this is folly and disgrace to him.
He who answers before he hears, that is folly and shame to him.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
16 Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
Read Proverbs 18 in the app The whole chapter