The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 16
Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
Proverbs 16:19 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 16Next →
Better it is to be of an humble spirit with the lowly, than to divide the spoil with the proud.
It is better to be lowly in spirit among the humble than to divide the spoil with the proud.
It is better to be of a lowly spirit with the poor, than to divide the plunder with the proud.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
16 Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
17 Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
18 Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
19 Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
20 Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
Read Proverbs 16 in the app The whole chapter