The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 1
Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
Proverbs 1:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 1Next →
To give subtilty to the simple, to the young man knowledge and discretion.
To impart prudence to the simple and knowledge and discretion to the young,
to give prudence to the simple, knowledge and discretion to the young man—
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
2 Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
3 nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
5 Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6 Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
7 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
Read Proverbs 1 in the app The whole chapter