The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 1
ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
Proverbs 1:26 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 1Next →
I also will laugh at your calamity; I will mock when your fear cometh;
in turn I will mock your calamity; I will sneer when terror strikes you,
I also will laugh at your disaster. I will mock when calamity overtakes you,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
23 Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.
24 Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
25 ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
26 ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
27 Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
28 “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29 Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
Read Proverbs 1 in the app The whole chapter