The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Philippians 4
Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.
Philippians 4:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Philippians 4Next →
I beseech Euodias, and beseech Syntyche, that they be of the same mind in the Lord.
I urge Euodia and Syntyche to agree with each other in the Lord.
I exhort Euodia, and I exhort Syntyche, to think the same way in the Lord.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.
2 Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.
3 E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.
4 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!
5 Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
Read Philippians 4 in the app The whole chapter