The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 9

Numbers 9:8

Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”

Numbers 9:8 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 9Next →

Numbers 9:8 in other translations

KJV King James Version

And Moses said unto them, Stand still, and I will hear what the LORD will command concerning you.

BSB Berean Standard Bible

“Wait here until I find out what the LORD commands concerning you,” Moses replied.

WEB World English Bible

Moses answered them, “Wait, that I may hear what the LORD will command concerning you.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

5 Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

6 Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ,

7 sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka?”

8 Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”

9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

10 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.

11 Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu.

Read Numbers 9 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV