The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 9

Numbers 9:4

Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga.

Numbers 9:4 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 9Next →

Numbers 9:4 in other translations

KJV King James Version

And Moses spake unto the children of Israel, that they should keep the passover.

BSB Berean Standard Bible

So Moses told the Israelites to observe the Passover,

WEB World English Bible

Moses told the children of Israel that they should keep the Passover.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya,

2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka.

3 Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”

4 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga.

5 Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

6 Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ,

7 sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka?”

Read Numbers 9 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV