The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 8
Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.
Numbers 8:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 8Next →
And this work of the candlestick was of beaten gold, unto the shaft thereof, unto the flowers thereof, was beaten work: according unto the pattern which the LORD had shewed Moses, so he made the candlestick.
This is how the lampstand was constructed: it was made of hammered gold from its base to its blossoms, fashioned according to the pattern the LORD had shown Moses.
This was the workmanship of the lamp stand, beaten work of gold. From its base to its flowers, it was beaten work. He made the lamp stand according to the pattern which the LORD had shown Moses.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’ ”
3 Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
4 Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.
5 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
6 “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha.
7 Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.
Read Numbers 8 in the app The whole chapter