The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 7
Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha.
Numbers 7:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 7Next →
That the princes of Israel, heads of the house of their fathers, who were the princes of the tribes, and were over them that were numbered, offered:
And the leaders of Israel, the heads of their families, presented an offering. These men were the tribal leaders who had supervised the registration.
the princes of Israel, the heads of their fathers’ houses, gave offerings. These were the princes of the tribes. These are they who were over those who were counted;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile.
2 Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha.
3 Ha wetara dịka onyinye ha nye Onyenwe anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ.
4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
5 “Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.”
Read Numbers 7 in the app The whole chapter