The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 6
“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
Numbers 6:23 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 6Next →
Speak unto Aaron and unto his sons, saying, On this wise ye shall bless the children of Israel, saying unto them,
“Tell Aaron and his sons: This is how you are to bless the Israelites. Say to them:
“Speak to Aaron and to his sons, saying, ‘This is how you shall bless the children of Israel.’ You shall tell them,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
20 Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.
21 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”
22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
24 “ ‘ “Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,
25 Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara,
26 Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.” ’
Read Numbers 6 in the app The whole chapter