The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 6
“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
Numbers 6:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 6Next →
And this is the law of the Nazarite, when the days of his separation are fulfilled: he shall be brought unto the door of the tabernacle of the congregation:
Now this is the law of the Nazirite when his time of separation is complete: He must be brought to the entrance to the Tent of Meeting,
“‘This is the law of the Nazirite: when the days of his separation are fulfilled, he shall be brought to the door of the Tent of Meeting,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
11 Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ.
12 Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
13 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
14 Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo,
15 tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
16 “ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ.
Read Numbers 6 in the app The whole chapter