The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 4
Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
Numbers 4:8 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 4Next →
And they shall spread upon them a cloth of scarlet, and cover the same with a covering of badgers' skins, and shall put in the staves thereof.
And they shall spread a scarlet cloth over them, cover them with fine leather, and insert the poles.
They shall spread on them a scarlet cloth, and cover it with a covering of sealskin, and shall put in its poles.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
6 Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị.
7 “Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
8 Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
9 “Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
10 Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.
11 “Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
Read Numbers 4 in the app The whole chapter