The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 33
Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
Numbers 33:53 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 33Next →
And ye shall dispossess the inhabitants of the land, and dwell therein: for I have given you the land to possess it.
You are to take possession of the land and settle in it, for I have given you the land to possess.
You shall take possession of the land, and dwell therein; for I have given the land to you to possess it.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
50 Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,
51 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
52 unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.
53 Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
54 Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.
55 “ ‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya.
56 Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’ ”
Read Numbers 33 in the app The whole chapter