The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 33
Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
Numbers 33:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 33Next →
And the children of Israel removed from Rameses, and pitched in Succoth.
The Israelites set out from Rameses and camped at Succoth.
The children of Israel traveled from Rameses, and encamped in Succoth.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
3 Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
4 mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
5 Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
6 Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
7 Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
8 Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
Read Numbers 33 in the app The whole chapter