The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 32
Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
Numbers 32:24 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 32Next →
Build you cities for your little ones, and folds for your sheep; and do that which hath proceeded out of your mouth.
Build cities for your little ones and folds for your flocks, but do what you have promised.”
Build cities for your little ones, and folds for your sheep; and do that which has proceeded out of your mouth.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
21 Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
22 mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
23 “Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
24 Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
25 Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
26 Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
27 Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
Read Numbers 32 in the app The whole chapter