The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 3
Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.
Numbers 3:30 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 3Next →
And the chief of the house of the father of the families of the Kohathites shall be Elizaphan the son of Uzziel.
and the leader of the families of the Kohathites was Elizaphan son of Uzziel.
The prince of the fathers’ house of the families of the Kohathites shall be Elizaphan the son of Uzziel.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
27 Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat.
28 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.
29 Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.
30 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.
31 Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi.
32 Onyeisi ndị ndu nke ndị Livayị bụ Elieza nwa Erọn, onye nchụaja. Ọ bụ ya na-elekọta ndị ọrụ ha bụ ihu maka ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ.
33 Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari.
Read Numbers 3 in the app The whole chapter