The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 3
“Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
Numbers 3:15 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 3Next →
Number the children of Levi after the house of their fathers, by their families: every male from a month old and upward shalt thou number them.
“Number the Levites by their families and clans. You are to count every male a month old or more.”
“Count the children of Levi by their fathers’ houses, by their families. You shall count every male from a month old and upward.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
12 “Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m.
13 Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.”
14 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya,
15 “Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
16 Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
17 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị: Geshọn, Kohat na Merari.
18 Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị: Libni na Shimei.
Read Numbers 3 in the app The whole chapter