The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 25
Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
Numbers 25:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 25Next →
And he shall have it, and his seed after him, even the covenant of an everlasting priesthood; because he was zealous for his God, and made an atonement for the children of Israel.
It will be a covenant of permanent priesthood for him and his descendants, because he was zealous for his God and made atonement for the Israelites.”
It shall be to him, and to his offspring after him, the covenant of an everlasting priesthood, because he was jealous for his God, and made atonement for the children of Israel.’”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
11 “Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.
12 Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.
13 Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
14 Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.
15 Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia.
16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Read Numbers 25 in the app The whole chapter