The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 22
Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa.
Numbers 22:35 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 22Next →
And the angel of the LORD said unto Balaam, Go with the men: but only the word that I shall speak unto thee, that thou shalt speak. So Balaam went with the princes of Balak.
But the angel of the LORD said to Balaam, “Go with the men, but you are to speak only what I tell you.” So Balaam went with the princes of Balak.
The LORD’s angel said to Balaam, “Go with the men; but you shall only speak the word that I shall speak to you.” So Balaam went with the princes of Balak.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
32 Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe ugboro atọ? Abịara m igbochi gị ka ịla nʼiyi dị na-eche gị ghara irute gị.
33 Ugboro atọ ka ịnyịnya ibu a hụrụ m, ma site nʼihu m wezuga onwe ya. A sị na ọ bụghị ntụgharị ọ tụgharịrị site nʼebe m nọ, nʼezie, ugbu a, a gara m egbu gị ma hapụ ịnyịnya ibu gị ndụ.”
34 Nʼoge a, Belam sịrị mmụọ ozi Onyenwe anyị, “Emehiela m. Amaghị m na i guzo nʼụzọ igbochi m. Ọ bụrụ iwe na-ewe gị, ejikeere m ịlaghachi azụ.”
35 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa.
36 Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya.
37 Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?”
38 Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
Read Numbers 22 in the app The whole chapter