The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 22

Numbers 22:15

Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.

Numbers 22:15 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 22Next →

Numbers 22:15 in other translations

KJV King James Version

And Balak sent yet again princes, more, and more honourable than they.

BSB Berean Standard Bible

Then Balak sent other princes, more numerous and more distinguished than the first messengers.

WEB World English Bible

Balak again sent princes, more, and more honorable than they.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

12 Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”

13 Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na Onyenwe anyị ekweghị ka m soro unu.”

14 Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.”

15 Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.

16 Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m.

17 Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.”

18 Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m.

Read Numbers 22 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV