The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 21

Numbers 21:26

Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.

Numbers 21:26 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 21Next →

Numbers 21:26 in other translations

KJV King James Version

For Heshbon was the city of Sihon the king of the Amorites, who had fought against the former king of Moab, and taken all his land out of his hand, even unto Arnon.

BSB Berean Standard Bible

Heshbon was the city of Sihon king of the Amorites, who had fought against the former king of Moab and taken all his land as far as the Arnon.

WEB World English Bible

For Heshbon was the city of Sihon the king of the Amorites, who had fought against the former king of Moab, and taken all his land out of his hand, even to the Arnon.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

23 Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.

24 Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.

25 Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu.

26 Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.

27 Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike.

28 “Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.

29 Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait.

Read Numbers 21 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV