The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 21

Numbers 21:1

Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.

Numbers 21:1 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 21Next →

Numbers 21:1 in other translations

KJV King James Version

And when king Arad the Canaanite, which dwelt in the south, heard tell that Israel came by the way of the spies; then he fought against Israel, and took some of them prisoners.

BSB Berean Standard Bible

When the Canaanite king of Arad, who lived in the Negev, heard that Israel was coming along the road to Atharim, he attacked Israel and captured some prisoners.

WEB World English Bible

The Canaanite, the king of Arad, who lived in the South, heard that Israel came by the way of Atharim. He fought against Israel, and took some of them captive.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.

2 Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”

3 Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa.

4 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.

Read Numbers 21 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV