The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 20

Numbers 20:26

Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”

Numbers 20:26 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 20Next →

Numbers 20:26 in other translations

KJV King James Version

And strip Aaron of his garments, and put them upon Eleazar his son: and Aaron shall be gathered unto his people, and shall die there.

BSB Berean Standard Bible

Remove Aaron’s priestly garments and put them on his son Eleazar. Aaron will be gathered to his people and will die there.”

WEB World English Bible

and strip Aaron of his garments, and put them on Eleazar his son. Aaron shall be gathered, and shall die there.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

23 Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,

24 “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.

25 Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.

26 Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”

27 Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.

28 Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.

29 Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.

Read Numbers 20 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV