The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 20

Numbers 20:18

Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”

Numbers 20:18 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 20Next →

Numbers 20:18 in other translations

KJV King James Version

And Edom said unto him, Thou shalt not pass by me, lest I come out against thee with the sword.

BSB Berean Standard Bible

But Edom answered, “You may not travel through our land, or we will come out and confront you with the sword.”

WEB World English Bible

Edom said to him, “You shall not pass through me, lest I come out with the sword against you.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

15 Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.

16 Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.

17 Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”

18 Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”

19 Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”

20 Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.

21 Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.

Read Numbers 20 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV