The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 2

Numbers 2:33

Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Numbers 2:33 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 2Next →

Numbers 2:33 in other translations

KJV King James Version

But the Levites were not numbered among the children of Israel; as the LORD commanded Moses.

BSB Berean Standard Bible

But the Levites were not counted among the other Israelites, as the LORD had commanded Moses.

WEB World English Bible

But the Levites were not counted among the children of Israel, as the LORD commanded Moses.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

30 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

31 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.

32 Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ.

33 Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

34 Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.

Read Numbers 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV