The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 18
Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.
Numbers 18:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 18Next →
And they shall be joined unto thee, and keep the charge of the tabernacle of the congregation, for all the service of the tabernacle: and a stranger shall not come nigh unto you.
They are to join you and attend to the duties of the Tent of Meeting, doing all the work at the Tent; but no outsider may come near you.
They shall be joined to you and keep the responsibility of the Tent of Meeting, for all the service of the Tent. A stranger shall not come near to you.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Onyenwe anyị gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja.
2 Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama.
3 Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ.
4 Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.
5 “Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe Onyenwe anyị ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ.
6 Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute.
7 Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.”
Read Numbers 18 in the app The whole chapter