The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 18
Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
Numbers 18:20 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 18Next →
And the LORD spake unto Aaron, Thou shalt have no inheritance in their land, neither shalt thou have any part among them: I am thy part and thine inheritance among the children of Israel.
Then the LORD said to Aaron, “You will have no inheritance in their land, nor will you have any portion among them. I am your portion and your inheritance among the Israelites.
The LORD said to Aaron, “You shall have no inheritance in their land, neither shall you have any portion among them. I am your portion and your inheritance among the children of Israel.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
17 “Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
18 Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị.
19 Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”
20 Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
21 “Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute.
22 Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ.
23 Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel.
Read Numbers 18 in the app The whole chapter