The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 18
A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ.
Numbers 18:10 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 18Next →
In the most holy place shalt thou eat it; every male shall eat it: it shall be holy unto thee.
You are to eat it as a most holy offering, and every male may eat it. You shall regard it as holy.
You shall eat of it like the most holy things. Every male shall eat of it. It shall be holy to you.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
7 Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.”
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi.
9 Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom.
10 A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ.
11 “Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya.
12 “Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara Onyenwe anyị.
13 Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara Onyenwe anyị, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya.
Read Numbers 18 in the app The whole chapter