The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 16
Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
Numbers 16:16 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 16Next →
And Moses said unto Korah, Be thou and all thy company before the LORD, thou, and they, and Aaron, to morrow:
And Moses said to Korah, “You and all your followers are to appear before the LORD tomorrow—you and they and Aaron.
Moses said to Korah, “You and all your company go before the LORD, you, and they, and Aaron, tomorrow.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
14 Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
15 Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
16 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
17 Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
18 Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
Read Numbers 16 in the app The whole chapter