The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 15

Numbers 15:22

“ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,

Numbers 15:22 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 15Next →

Numbers 15:22 in other translations

KJV King James Version

And if ye have erred, and not observed all these commandments, which the LORD hath spoken unto Moses,

BSB Berean Standard Bible

Now if you stray unintentionally and do not obey all these commandments that the LORD has spoken to Moses—

WEB World English Bible

“‘When you err, and don’t observe all these commandments which the LORD has spoken to Moses—

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

19 ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye Onyenwe anyị.

20 Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka.

21 Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

22 “ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,

23 bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.

24 Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.

25 Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.

Read Numbers 15 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV