The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 14

Numbers 14:23

o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya.

Numbers 14:23 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 14Next →

Numbers 14:23 in other translations

KJV King James Version

Surely they shall not see the land which I sware unto their fathers, neither shall any of them that provoked me see it:

BSB Berean Standard Bible

not one will ever see the land that I swore to give their fathers. None of those who have treated Me with contempt will see it.

WEB World English Bible

surely they shall not see the land which I swore to their fathers, neither shall any of those who despised me see it.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ.

21 Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.

22 Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a,

23 o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya.

24 Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya.

25 Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.”

26 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,

Read Numbers 14 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV